8. Abaijam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; ha we lìe ya n'obodo Devid: Esa nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
9. Ma n'arọ nke-orú nke Jeroboam eze Israel ka Esa malitere ibu eze Juda.
10. Ọgu arọ abua na otù ka ọ bu eze na Jerusalem: aha nne-ya bu Meaka nwa-nwayi Abishalom.
11. Esa mere ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika Devid, bú nna-ya, mere.
12. O we me ka ndi edoro nsọ ikwa iko si n'ala-ya gabiga, o wezuga-kwa-ra arusi nile nke nna-ya-hà mere.
13. Ọzọ kwa, Meaka, bú nne-ya, o wezuga-kwa-ra ya n'ibu eze-nwayi, n'ihi na o mere ihe kpatara ima-jijiji nye Ashera; Esa we b͕utue ihe-ya kpatara ima-jijiji, o sure ya ọku na miri-iyi Kidron.
14. Ma ewezugaghi ebe di elu: otú ọ di, obi Esa zuru okè n'ebe Jehova nọ ubọchi-ya nile.
15. Ọ chibata n'ulo Jehova ihe nile nna-ya doro nsọ, na ihe nile ya onwe-ya doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe di iche iche ọzọ.
16. Ma agha di n'etiti Esa na Beasha, bú eze Israel, ubọchi-ha nile.
17. Beasha, bú eze Israel, we rigo imegide Juda, wue Rema, ka ọ ghara ikwe Esa, bú eze Juda, ka o nwe onye nāpu apu ma-ọbu onye nābata abata.
18. Esa we chiri ọla-ọcha nile na ọla-edo nile nke fọduru n'àkù ulo Jehova, na àkù ulo eze nile, nye ha n'aka ndi-orù-ya: eze, bú Esa, we ziga ha jekuru Ben-hedad, nwa Tab-rimon, nwa Hezion, bú eze Siria, nke bi na Damaskọs, si,