Bible Nso

1. Ndi-Eze 15:19-25 Bible Nso (IGBOB)

19. Ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti mu na gi, na n'etiti nnam na nna-gi: le, eziteworom gi onyinye, bú ọla-ọcha na ọla-edo; je, mebie ọb͕ub͕a-ndu gi na Beasha, bú eze Israel, b͕ara, ka o we si n'arum rigo.

20. Ben-hedad we ge eze, bú Esa, nti, zite ndi-isi usu nile nke ndi-agha o nwere imegide obodo nile nke Israel, o we tib͕ue Ijon, na Dan, na Ebel-bet-meaka, na Kinerot nile, tiyere ala nile nke Naftali.

21. O rue, mb͕e Beasha nuru ya, na ọ rapuru iwu Rema, we biri na Tiaza.

22. Ma eze, bú Esa, mere ka Juda nile nu; ọ dighi onye puru ya: ha we bupu nkume nile nke Rema, na osisi-ya nile, nke Beasha ji wu ya; eze, bú Esa, we were ha wue Geba Benjamin na Mizpa.

23. Ma okwu Esa nile nke fọduru, na idi-ike-ya nile, na ihe nile o mere, na obodo nile o wuru, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? Nání na ọ riara ọria n'ukwu-ya abua na mb͕e agadi-ya.

24. Esa we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid, bú nna-ya: Jehoshafat nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

25. Ma Nedab, bú nwa Jeroboam, malitere ibu eze Israel n'arọ nke-abua nke Esa, bú eze Juda, ọ we buru eze Israel arọ abua.