Bible Nso

1. Ndi-Eze 11:25-32 Bible Nso (IGBOB)

25. Ọ we ghọrọ Israel onye-nmegide ubọchi nile nke Solomon, tiyere ihe ọjọ nke Hedad mere: ike Israel we gwusia ya, o we buru eze Siria.

26. Ma Jeroboam nwa Nebat, onye Efrata nke Zerida, bu orù Solomon nwere, aha nne-ya bu Zerua, nwayi di-ya nwuru, o weli-kwa-ra aka-ya megide eze.

27. Ma nka bu ihe kpatara o ji welie aka-ya megide eze: Solomon wuru Milo, mechie ntipú obodo Devid, bú nna-ya.

28. Nwoke ahu, bú Jeroboam, bu dike nke bu dìnkpà: Solomon we hu nwa-okorọbia ahu, na onye nēje ozi nke-ọma ka ọ bu, o we me ya ka ọ buru onye-nlekọta ibū nile nke ulo Josef.

29. O rue, na mb͕e ahu, na Jeroboam siri na Jerusalem pua, onye-amuma, bú Ahaija, bú onye Shailo, we chọta ya n'uzọ; ma Ahaija nēwere uwe ọhu yikwasi n'aru-ya; ha abua nọ kwa iche, nání ha, n'ọhia.

30. Ahaija we jide uwe ọhu ahu nke di n'aru ya, dọwa ya na ndọwa iri na abua.

31. Ọ si Jeroboam, Chiri n'onwe-gi ndọwa iri: n'ihi na otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Le, M'nādọwapu ala-eze a n'aka Solomon, M'gēnye kwa gi ebo iri:

32. (ma ọ gēnwe otù ebo ahu, n'ihi orùm, bú Devid, na n'ihi Jerusalem, bú obodo nke M'rọputaworo n'ebo nile nke Israel:)