Bible Nso

Ndi Kọlọsi 4:7-10 Bible Nso (IGBOB)

7. Madu nke gēme ka unu mara ihe nile bayere mu onwem bu Tikikọs, onye bu nwa-nna-ayi ahu ahuru n'anya, buru kwa onye kwesiri ntukwasi-obi n'ije-ozi, buru kwa orù-ibem nime Onye-nwe-ayi:

8. onye m'nēzitere unu ime ihe a, ka unu we mara otú ihe nāgara ayi, ka o we kasi kwa obi-unu.

9. Anamezite kwa Ọnisimọs, bú nwa-nna-ayi ahu kwesiri ntukwasi-obi, onye ahu-kwa-ra n'anya, onye bu otù onye n'etiti unu. Ha gēme ka unu mara ihe nile nke anēme n'ebe a.

10. Aristakọs onye adọkọrọ mu na ya n'agha nēkele unu, ya na Mak nwa-nne Banabas (onye unu natara ihe ufọdu enyere n'iwu bayere ya; asi na ọ biakute unu, naranu ya nke-ọma),