Bible Nso

Ndi Kọlọsi 4:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ndi-nwe madu, nēnye-kwa-nu ndi-orù-unu ihe ziri ezi na nke ra nrata; ebe unu matara na unu onwe-unu nwe-kwa-ra otù Onye Nke bu Onye-nwe-unu n'elu-igwe.

2. Nānọgidesinu ike n'ekpere-unu, nāmu-kwa-nu anya nime ya n'ikele-ekele;

3. nēkpe-kwa-nu ekpere n'ihi ayi n'otù oge ahu, ka Chineke we meghere ayi ọnu-uzọ ikwusa okwu-Ya, ka ayi kwue ihe-omimi nke Kraist, nke m'nọ kwa n'ab͕u n'ihi ya;

4. ka m'we me ka ọ puta ìhè, dika m'nāghaghi ikwu ya.

5. Nējegharinu n'amam-ihe n'ebe ndi nọ n'èzí nọ, nāzuchapuru onwe-unu oge a nile.