Bible Nso

Maika 7:6-12 Bible Nso (IGBOB)

6. N'ihi na nwa-nwoke nākpọ nna-ya onye-nzuzu, nwa-nwanyi nēbili imegide nne-ya, nwunye nwa imegide nne di-ya; ndi-iro madu bu ndi ulo-ya.

7. Ma mu onwem, nime Jehova ka m'gēche nche nke-ọma; M'gēchere Chineke nke nzọputam: Chinekem gānu olum.

8. Aṅulam ọṅu, gi onye-irom: mb͕e m'dara ada, m'bilie; mb͕e m'nānọdu n'ọchichiri, Jehova gāburum ìhè.

9. Iwe di ọku nke Jehova ka m'gēbu, n'ihi na emehiewom megide Ya; rue mb͕e Ọ gēkpe ọnum, me ihe ekpere n'ikpem, Ọ gēme ka m'puta n'ìhè, m'gēlekwasi kwa ezi omume-Ya anya.

10. Nwanyi-irom gāhu kwa ya, ihere ewe kpuchie ya iru; bú onye nāsim, Òle ebe Jehova, bú Chineke-gi, nọ? Anyam abua gēlekwasi ya; ub͕u a ka ọ gāghọ ihe-nzọtọ dika apiti nke èzí.

11. Ubọchi ib͕a ogige-gi nile gādi! n'ubọchi ahu ka ókè-gi gādi n'ebe di anya.

12. N'ubọchi ahu ọ bu kwa gi ka agābiakute, site n'Asiria na obodo nile nke Ijipt, site kwa n'Ijipt we rue Osimiri, site kwa n'oké osimiri rue oké osimiri, site kwa n'ugwu rue ugwu.