Bible Nso

Maika 6:13-16 Bible Nso (IGBOB)

13. Ọzọ kwa, Mu onwem etiputawom i ọnyá jọb͕uru onwe-ya; emewom i ka i tọb͕ọrọ n'efu n'ihi nmehie-gi nile.

14. Gi onwe-gi gēri ihe, ma afọ agaghi-eju gi; afọ-awọrọ-gi gādigide kwa nime gi: i gēwezuga kwa ndi-gi, ma i gaghi-eme ka ha b͕apu; ma ndi i nēme ka ha b͕apu, ọ bu mma-agha ka M'gēwere ha nye.

15. Gi onwe-gi gāgha nkpuru, ma i gaghi-ewe ihe-ubi: gi onwe-gi gāzọcha nkpuru osisi olive, ma i gaghi-ete manu n'aru gi; i gāzọchapu kwa manya-vine ọhu, ma i gaghi-aṅu manya-vine.

16. N'ihi na anēdebe ukpuru nile nke Ọmri, na ọlu nile nke ulo Ehab, unu ewe jeghari nime ndum-ọdu nile ha: ka M'we me gi ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, me kwa ndi bi nime-ya ka ha ghọ ihe-ima-ọsọ; ọ bu kwa ita-uta ndim ka unu gēbu.