Bible Nso

Maika 1:13-16 Bible Nso (IGBOB)

13. Kegide ub͕ọ-ala n'inyinya ukwu ọsọ, gi nwanyi bi na Lekish: isi-nmalite nmehie ka ọ buru ada Zaion; n'ihi na ọ bu nime gi ka ahuru njehie nile nke Israel.

14. N'ihi nka ka i gēnye Moreshet-gat ihe-idu-ulo di iche iche: ulo nile nke Akzib gāghọrọ ndi-eze Israel miri-iyi nārafu arafu.

15. Ọzọ, onye-nnweta ka M'gēme ka ọ biakute gi, gi nwanyi bi na Maresha: rue Adulam ka nsọpuru Israel gābia.

16. Mere onwe-gi isi-nkwọcha, kọpu isi-gi n'ihi umu nke ihe-utọ-gi nile: me ka isi-nkwọcha-gi sa mbara dika nke udele; n'ihi na emewo ka ha si n'ebe i nọ je biri n'ala ọzọ.