Bible Nso

Failimon 1:22-24 Bible Nso (IGBOB)

22. Ma ọzọ kwa, dozi-kwa-ram ebe m'gānọ dika ọbìa: n'ihi na anamele anya na agēwerem nye unu n'amara site n'ekpere-unu.

23. Epafras, onye adọkọro mu na ya n'agha nime Kraist Jisus, nēkele gi;

24. ọ bu kwa otú a Mak na Aristakọs na Dimas na Luk, bú ndi mu na ha nālukọ ọlu, nēkele unu.