Bible Nso

Failimon 1:15-20 Bible Nso (IGBOB)

15. N'ihi na eleghi anya ọ bu n'ihi nka ka ekewapuru ya n'ebe i nọ nwa oge ntà, ka i we nwe ya ebighi-ebi;

16. ọ dighi kwa ka orù ọzọ, kama ọ kariri orù, ọ di ka nwa-nna ahuru n'anya, nke kachasinu n'ebe m'nọ, ma nke kariri nke ahu nke-uku n'ebe i nọ, nime anu-aru na nime Onye-nwe-ayi kwa.

17. Ya mere ọ buru na i gurum n'onye-nnwekọ, nara ya nke-ọma dika mu onwem.

18. Ma ọ buru na o mejọrọ gi n'uzọ ọ bula, ma-ọbu na o ji gi ugwọ ọ bula, gua ya n'ugwọ m'ji gi;

19. Mu onwem, bú Pọl, were aka nkem de ya n'akwukwọ a, mu onwem gākwughachi ya: ka m'ghara igwa gi na ọ bu kwa onwe-gi ka i jim n'ugwọ tukwasi ihe ọzọ.

20. E, nwa-nnam, kwe ka mu onwem nwe obi-utọ n'aru gi nime Onye-nwe-ayi: me ka obim zuru ike nime Kraist.