Bible Nso

Ezra 9:12-15 Bible Nso (IGBOB)

12. Ma ub͕u a unu enyela umu-ha ndikom umu-unu ndinyom, unu ekuru-kwa-la umu-ha ndinyom nye umu-unu ndikom, unu achọ-kwa-la udo-ha ma-ọbu ọdi-nma-ha rue mb͕e ebighi-ebi: ka unu we di ike, rie ezi ihe nke ala ahu, me kwa ka umu-unu nweta ya rue mb͕e ebighi-ebi.

13. Ma mb͕e ihe nile a gasiri, nke nābiakwasi ayi n'ihi omume ọjọ nile ayi, na n'ihi ikpe-ọmuma uku ayi, n'ihi na Gi onwe-gi, bú Chineke-ayi, eb͕ochiwo ahuhu-nmehie-ayi, ka ọ ghara idi elu ka ajọ omume-ayi, I we nye ndi-nb͕apu di otú a,

14. àyi gālaghachi kwa mebie ihe nile I nyere n'iwu, we ghọ ọgọ ndi ahu ndi nēme ihe-árú ndia? Ì gaghi-ewesa ayi iwe, rue mb͕e emere ka ayi gwusi, ndi fọduru ma-ọbu ndi-nb͕apu we ghara idi?

15. Jehova, bú Chineke Israel, onye ezi omume ka I bu; n'ihi na ayi fọduru ibu ndi-nb͕apu, dika o si di ta: le, ayi nọ n'iru Gi n'ikpe-ọmuma-ayi; n'ihi na ọ dighi onye iguzo n'iru Gi n'ihi nka.