Bible Nso

Ezra 8:15-19 Bible Nso (IGBOB)

15. M'we chikọta ha rue osimiri nke nērùbata n'Ahava; ayi we nọ n'ọmuma-ulo-ikwū n'ebe ahu ubọchi atọ: m'we mata ndi ahu, mata kwa ndi-nchu-àjà, ma ọ dighi onye nime umu Livai m'chọtara n'ebe ahu.

16. M'we zìe kpọ Elieza, kpọ kwa Ariel, kpọ kwa Shemaia, kpọ kwa Elnetan, kpọ kwa Jarib, kpọ kwa Elnetan, kpọ kwa Netan, kpọ kwa Zekaraia, kpọ kwa Meshulam, bú ndi-isi; m'kpọ kwa Joiarib, kpọ kwa Elnetan, bú ndi-nghọta.

17. M'we nye ha iwu inye Ido, bú onye-isi na Kasifia, bú ebe ahu; m'we tiye n'ọnu-ha okwu igwa Ido, bú nwa-nne-ya, na Netinim, nime Kasifia, bú ebe ahu, ka ha me ka ndi nējere ulo Chineke-ayi ozi biakute ayi.

18. Ha we me ka otù nwoke nke nwere uche biakute ayi, dika ezi aka nke Chineke-ayi si di n'aru ayi, o sitere n'umu Mahli, nwa Livai, nwa Israel; na Sherebia na umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri-na-asatọ;

19. na Hashabaia, ya na Jeshaia nke sitere n'umu Merari, na umu-nne-ya na umu-ha ndikom, orú madu;