Bible Nso

Ezra 7:4-16 Bible Nso (IGBOB)

4. nwa Zerahia, nwa Uzi, nwa Buki,

5. nwa Abishua, nwa Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, bú onye-isi-nchu-àjà:

6. Ezra nka siri na Babilon rigo; ma onye ahu bu ode-akwukwọ nke bu onye-ọ̀kà n'iwu Moses, nke Jehova, bú Chineke Israel, nyere: eze we nye ya ihe nile ọ riọrọ, dika aka Jehova, bú Chineke-ya, si di n'aru ya.

7. Ufọdu nime umu Israel na nime ndi-nchu-àjà na ndi Livai na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama na Netinim we rigorue Jerusalem n'arọ nke-asa nke Ataksakses, bú eze.

8. O we biarue Jerusalem n'ọnwa nke-ise, nke ahu di n'arọ nke-asa nke eze.

9. N'ihi na n'ubọchi mbu nke ọnwa mbu, nke ahu bu ntọ-ala nke nrigo ahu site na Babilon, ma ọ bu n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-ise ka ọ biaruru Jerusalem, dika ezi aka Chineke-ya si di n'aru ya.

10. N'ihi na Ezra doziri obi-ya ichọ iwu Jehova, na ime ya, na izí ukpuru-Ya na ikpé-Ya n'Israel.

11. Ma nka bu ndeputa akwukwọ-ozi ahu nke eze, bú Ataksakses, nyere Ezra, bú onye-nchu-aja, bú ode-akwukwọ, ọbuná ode-akwukwọ nke okwu nile nke ihe nile Jehova nyere n'iwu, na nke ukpuru-Ya nile O nyere Israel.

12. Ataksakses, bú eze nāchi ndi-eze, nēdegara Ezra akwukwọ, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ nke iwu Chineke nke elu-igwe, onye zuru okè, na ihe ọzọ di otú a.

13. Esitewo n'akam nye iwu, na onye ọ bula nke nwere afọ-ofufo ije Jerusalem nime ndi Israel, na ndi-nchu-àjà-ha na ndi Livai, n'ala-ezem, ya so gi je.

14. N'ihi na anēsi n'iru eze na madu asa ndi nādu ya ọdu ziga gi iwere iwu Chineke-gi nke di n'aka-gi ju ajuju bayere Juda, baye-kwa-ra Jerusalem;

15. na ibūru ọla-ọcha na ọla-edo nke eze na ndi nādu ya ọdu were afọ-ofufo nye Chineke Israel, Onye ebe-obibi-Ya di na Jerusalem,

16. na ọla-ọcha na ọla-edo nile nke i gāchọta n'ala ahu nile anāchi achi, bú Babilon, tiyere onyinye-afọ-ofufo nke ndi-gi, na nke ndi-nchu-àjà-ha, ndi nēwere afọ-ofufo nye onwe-ha bayere ulo Chineke-ha nke di na Jerusalem;