Bible Nso

Ezra 6:17-19 Bible Nso (IGBOB)

17. Ha we weta nso n'irara ulo a nke Chineke nye Chineke ọgu oke-ehi ise, na ọgu ebulu iri, na nnù umu-aturu; na nkpi iri-na-abua, iji churu Israel nile àjà-nmehie, dika nguta nke ebo nile nke Israel si di.

18. Ha we guzo ndi-nchu-àjà nime nkewa-ha, na ndi Livai n'òkè-ha, bayere òfùfè Chineke, nke di na Jerusalem; dika edere ya n'akwukwọ Moses.

19. Umu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ we me ememe ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa mbu.