Bible Nso

Ezra 5:5-11 Bible Nso (IGBOB)

5. Ma anya Chineke-ha di n'aru ndi-okenye ndi-Ju, ha we ghara ime ka ha kwusi, rue mb͕e okwu ahu jeruru Daraiọs nti: mb͕e ahu ha we zighachi akwukwọ-ozi bayere ihe a.

6. Ndeputa akwukwọ-ozi nke Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ya, bú ndi-Afasakait, ndi nọ n'ofè osimiri, zigara Daraiọs, bú eze.

7. Ha zigara ya akwukwọ, otú a ka ede-kwa-ra nime ya; Daraiọs, bú eze, nwe akwukwọ a, udo nile diri ya.

8. Ka eze mara, na ayi jere n'ala anāchi achi, bú Juda, rue ulo Chineke uku, ma anēwere nkume nkpọrè wue ya, anēdo kwa osisi nime mb͕idi, anālu kwa ọlu a ọsọsọ, ọ nāga kwa nke-ọma n'aka-ha.

9. Mb͕e ahu ayi juru ndi-okenye ahu, si ha otú a, Ònye nyere unu iwu iwu ulo a, iluzu mb͕idi a?

10. Ọzọ kwa, ayi juru ha aha-ha, ime ka i mara, ka ayi we de aha ndikom ahu ndi bu isi-ha n'akwukwọ.

11. Ma otú a ka ha zaghachiri ayi okwu, si, Ayi onwe-ayi bu ndi-orù nke Chineke nke elu-igwe na uwa, ayi nēwu kwa ulo nke ewuru ọtutu arọ gara aga site na mb͕e a, nke otù eze uku nke Israel nwere wuru, wuzu kwa.