Bible Nso

Ezra 4:1-15 Bible Nso (IGBOB)

1. Ndi nākpab͕u Juda na Benjamin we nu na umu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ nēwuru Jehova, bú Chineke Israel, ulo uku;

2. ha we biarue Zerubabel nso, biaru kwa ndi-isi ulo nke ndi bu nna nso, si ha, Ka ayi so unu wue ulo: n'ihi na ayi nāchọ Chineke-unu, dika unu si achọ; ma ayi onwe-ayi adighi-achu àjà site n'ubọchi Isa-hadon, bú eze Asiria, onye mere ka ayi rigorue ebe a.

3. Zerubabel na Jeshua na ndi fọduru nke ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel we si ha, Ọ dighi nke ayi na unu nwekọrọ n'iwuru Chineke-ayi ulo; kama ayi onwe-ayi gēwukwara Jehova, bú Chineke Israel, ulo, dika eze, bú Sairọs eze Peasia, nyere ayi iwu.

4. O rue na ndi ala ahu nēme ka aka ndi Juda ghara idi ike, ha nēme kwa ka ha tua egwu n'iwu ulo,

5. ha nēgota kwa ndi nādu ọdu megide ha, imebi idu-ọdu-ha, ubọchi nile nke Sairọs, bú eze Peasia, ọbuná rue ọbubu-eze nke Daraiọs, bú eze Peasia.

6. Ma n'ọbubu-eze Ahasuerọs, na nmalite ọbubu-eze-ya, ha dere akwukwọ-nmegide imegide ndi bi na Juda na Jerusalem.

7. N'ubọchi Ataksakses ka Bishlam na Mitredat na Tabeel na ndi-òtù-ya fọduru degara Ataksakses, bú eze Peasia, akwukwọ; ma edewo odide akwukwọ-ozi ahu n'asusu Siria, asughariwo kwa ya n'asusu Siria.

8. Rehum, bú onye-nwe ikpé, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, degara Ataksakses, bú eze, akwukwọ-ozi imegide Jerusalem otú a:

9. mb͕e ahu ha dere akwukwọ, bú Rehum, bú onye-nwe ikpe, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha fọduru, bú ndi-Dinait, na ndi-Afasatkait, na ndi-Tapelait, na ndi-Afasait, na ni-Akevait, na ndi Babilon, na ndi Shushan, na ndi-Dehait, na ndi Ilam,

10. na mba fọduru ndi Ọsnapa di uku di kwa ebube mere ka ha bia biri n'ala a, o we me ka ha nọdu n'obodo Sameria, ha na ndi fọduru n'ofè osimiri, na ihe ọzọ di otú a.

11. Nka bu ndeputa edeputara n'akukwọ-ozi ahu nke ha zigara ya, bú Ataksakses, bú eze; Ndi-orù-gi, bú ndikom n'ofè osimiri, na ihe ọzọ di otú a.

12. Ka eze mara, na ndi-Ju, bú ndi siri n'ebe i nọ rigokute ayi, ha abawo na Jerusalem; ha nēwu obodo ahu nke nupuru isi nēsì kwa ísì, ha ewubìwo mb͕idi-ya nile, jikọta ntọ-ala-ya nile.

13. Ub͕u a, ka eze mara, na, ọ buru na ewue obodo a, wuzu kwa mb͕idi-ya nile, ọ dighi utu-ala, ma-ọbu utu-ahia, ma-ọbu utu-uzọ, ha gātu, ma n'ikpe-azu ọ gēme ka ihe funari ndi-eze.

14. Ub͕u a, n'ihi na nnú ulo uku eze bu nnú-ayi, na n'ihi na ayi enweghi ntachi-obi ihu ọtọ nke eze, ayi we zìe ozi me ka eze mara;

15. ka ewe chọ n'akwukwọ ihe-ncheta nke nna-gi-hà: i we chọta n'akwukwọ ihe-ncheta, mara kwa, na obodo a bu obodo na-enupu isi, nke nēme kwa ka ihe funari ndi-eze na ala nile anāchi achi, na ndi nākpali madu imegide ndi-isi nọ kwa n'etiti ya na mb͕e ochie: ọ bu n'ihi ya ka emere obodo a ka ọ buru nkpọnkpọ-ebe.