Bible Nso

Ezra 3:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọnwa nke-asa we rue, umu Israel nọ kwa n'obodo nile ha, ndi ahu we chikọta onwe-ha dika otù onye rue Jerusalem.

2. Jeshua nwa Jozadak, na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, na Zerubabel nwa Shealtiel, na umu-nne-ya, we bilie, wue ebe-ichu-àjà Chineke Israel, isure àjà-nsure-ọku n'elu ya, dika edeworo ya n'iwu Moses, bú onye nke Chineke.

3. Ha we me ka ebe-ichu-àjà guzosie ike n'ebe-ndọkwasi-ya nile; nihi na oké ujọ di n'aru ha n'ihi ndi ala ahu nile: ha we surere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ya, bú àjà-nsure-ọku anēsure ututu na anyasi.

4. Ha we me ememe ulo-ntu, dika edeworo ya, ha we chua àjà-nsure-ọku nke ubọchi n'ubọchi-ha n'ọnu-ọgugu, dika ikpé si di, bú ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya;

5. mb͕e ihe a gasiri ha we chua àjà-nsure-ọku nke mb͕e nile, na nke diri ọnwa ọhu, na nke diri mb͕e nile akara àkà nke Jehova, bú nke edoro nsọ, na nke diri onye ọ bula nke nēwere afọ-ofufo nye Jehova onyinye-afọ-ofufo.

6. Site n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-asa ka ha malitere isurere Jehova àjà-nsure-ọku: ma akātọghi ntọ-ala ulo uku Jehova.

7. Ha nye kwa ndi nāwa nkume, nye kwa ndi-ọ̀kà n'osisi, ego; ha nye kwa ndi Zaidon, nye kwa ndi Taia, ihe-oriri na ihe-ọṅuṅu na manu, ka ha we si na Lebanon bute osisi cedar rue oké osimiri, rue Jafo, dika nkwenye nke Sairọs, bú eze Peasia, kweyere ha.