Bible Nso

Ezra 2:57-62 Bible Nso (IGBOB)

57. na umu Shefataia, na umu Hatil, na umu Pokeret-hazébaim, na umu Ami.

58. Netinim nile, na umu ndi-orù Solomon, di ọgu iri-na-iteghete na iri na abua.

59. Ndia bu kwa ndi nārigo site na Tel-mela na Tel-hasha na Kerub na Adan na Imea: ma ha apughi igosi ulo nke ndi bu nna-ha, na nkpuru-ha, ma ọ bu Israel ka ha siri puta:

60. umu Delaia, na umu Tobaia, na umu Nekoda, nnù na ọgu iri-na-abua na iri na abua.

61. Site kwa n'umu ndi-nchu-àjà: umu Habaia, na umu Hakoz, na umu Bazilai, onye luru nwunye sitere n'umu-ndinyom Bazilai, bú onye Gilead, ewe kpọ ya aha n'aha-ha.

62. Ndia chọrọ odide-akwukwọ-ha n'etiti ndi edere n'akwukwọ-osuso-ọmumu, ma achọtaghi ha: ewe gua ha na ndi nādighi nsọ, ewe wepu ha n'ọlu-nchu-àjà.