37. Umu Imea, nnù abua na ọgu iri-na-abua na iri na abua.
38. Umu Pashua, nnù atọ na ọgu abua na asa.
39. Umu Harim, nnù abua na ọgu iri na iri na asa.
40. Ndi Livai: umu Jeshua na Kadmiel, nke umu Hodavaia, ọgu atọ na iri na anọ.
41. Ndi-ọbù-abù: umu Esaf, ọgu isi na asatọ.
42. Umu ndi-ọnu-uzọ-ama: umu Shalum, na umu Atea, na umu Talmon, na umu Akub, na umu Hatita, na umu Shobai, ha nile di ọgu isi na iri na iteghete.
43. Netinim: umu Ziha, na umu Hasufa, na umu Tabaot;
44. na umu Kiros, na umu Siaha, na umu Padon;
45. na umu Lebana, na umu Hagaba, na umu Akub;
46. na umu Hagab, na umu Shamlai, na umu Hanan;