Bible Nso

Ezra 2:31-40 Bible Nso (IGBOB)

31. Umu Ilam nke-ọzọ, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ.

32. Umu Harim, ọgu iri-na-isi.

33. Umu Lod na Hadid na Ono, nnù na ọgu iri-na-isi na ise.

34. Umu Jeriko, ọgu iri-na-asa na ise.

35. Umu Senaa, nnù iteghete na orú na iri.

36. Ndi-nchu-àjà: umu Jedaia, nke ulo Jeshua, nnù abua na ọgu asatọ na iri na atọ.

37. Umu Imea, nnù abua na ọgu iri-na-abua na iri na abua.

38. Umu Pashua, nnù atọ na ọgu abua na asa.

39. Umu Harim, nnù abua na ọgu iri na iri na asa.

40. Ndi Livai: umu Jeshua na Kadmiel, nke umu Hodavaia, ọgu atọ na iri na anọ.