Bible Nso

Ezra 2:10-29 Bible Nso (IGBOB)

10. Umu Bani, nnù na ọgu iri-na-abua na abua.

11. Umu Bebai, nnù na ọgu iri-na-otù na atọ.

12. Umu Azgad, nnù atọ na orú na abua.

13. Umu Adonikam, nnù na ọgu iri-na-atọ na isi.

14. Umu Bigvai, nnù ise na ọgu abua na iri na isi.

15. Umu Adin, nnù na ọgu abua na iri na anọ.

16. Umu Atea, nke Hezekaia, ọgu anọ na iri na asatọ.

17. Umu Bezai, ọgu iri-na-isi na atọ.

18. Umu Jora, ọgu ise na iri na abua.

19. Umu Hashum, ọgu iri-na-otù na atọ.

20. Umu Giba, ọgu anọ na iri na ise.

21. Umu Bet-lehem, ọgu isi na atọ.

22. Ndikom Netofa, ọgu abua na iri na isi.

23. Ndikom Anatot, ọgu isi na asatọ.

24. Umu Azmavet, ọgu abua na abua.

25. Umu Kiriat-arim na Kefira na Beirot, nnù na ọgu iri-na-asa na atọ.

26. Umu Rema na Geba, nnù na ọgu iri-na-otù na otù.

27. Ndikom Mikmas, ọgu isi na abua.

28. Ndikom Bet-el na Ai, ọgu iri-na-otù na atọ.

29. Umu Nebo, ọgu abua na iri na abua.