Bible Nso

Ezra 2:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndia bu umu ala ahu anāchi achi ndi nārigo, bú ndi sitere na ndọta-n'agha ahu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha je biri na Babilon, ha we laghachi na Jerusalem na Juda, nwoke ọ bula n'obodo-ya;

2. ndi ahu soro Zerubabel bia: bú Jeshua, Nehemaia, Seraia, Reelaia, Mọdekai, Bishan, Mispa, Bigvai, Rehum, Beana. Ọnu-ọgugu ndikom nke ndi Israel:

3. umu Parosh, nnù ise na ọgu asatọ na iri na abua.

4. Umu Shefataia, ọgu iri-na-asatọ na iri na abua.

5. Umu Ara, nnù na ọgu iri-na-asatọ na iri na ise.

6. Umu Pahat-moab, nke umu Jeshua na Joab, nnù asa na iri na abua.

7. Umu Ilam, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ.

8. Umu Zatu, nnù abua na ọgu asa na ise.

9. Umu Zakai, nnù na ọgu iri-na-asatọ.