Bible Nso

Ezra 10:2-7 Bible Nso (IGBOB)

2. Shekania nwa Jehiel, nke sitere n'umu Ilam, we za, si Ezra, Ayi onwe-ayi emekpuwo emekpu megide Chineke-ayi, luta ndinyom ala ọzọ sitere na ndi di iche iche nke ala nka: ma ub͕u a Israel nwere olile-anya bayere ihe a.

3. Ma ub͕u a ka ayi na Chineke-ayi b͕a ndu na ayi gēme ka ndinyom ahu nile na umu amuru site na ha pua, dika ndumọdu si di nke Onye-nwe-ayi, na nke ndi nāma jijiji n'ihe nile nke Chineke-ayi nyere n'iwu; dika iwu-Ya si di ka agēme kwa ya.

4. Bilie; n'ihi na okwu a diri gi, ayi onwe-ayi nọye-kwa-ra gi: di ike, me kwa ya.

5. Ezra we bilie, me ndi-isi nke ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Israel nile, ka ha ṅua iyi ime dika okwu a si di. Ha we ṅua iyi.

6. Ezra we si n'iru ulo Chineke bilie, jerue ime-ulo Jehohanan nwa Elaiashib: o we je n'ebe ahu, ma o righi nri, ọ ṅughi kwa miri: n'ihi na o nēru újú n'ihi nmekpu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ.

7. Ha we kwusa nime Juda na Jerusalem gwa umu nile nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ka ha chikọta onwe-ha na Jerusalem;