Bible Nso

Ezikiel 7:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova we ruem nti, si,

2. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri ala Israel, Ọgwugwu: ọgwugwu abiakwasiwo nkuku anọ nke ala-unu.

3. Ub͕u a ka ọgwugwu dikwasi gi, M'gēzite kwa iwem n'aru gi, kpe gi ikpe dika uzọ-gi nile si di; M'gētiyekwasi kwa gi ihe-árú-gi nile.

4. Anyam agaghi-eme-kwa-ra gi ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko: kama uzọ nile gi ka M'gētiyekwasi gi, ihe-árú-gi nile gādi kwa n'etiti gi: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.