Bible Nso

Ezikiel 48:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndia bu aha ebo nile: site na nsọtu Ugwu, n'akuku uzọ Hetlon rue nbata Hemat, Haza-inon n'ókè-ala Damaskọs, n'akuku Ugwu n'akuku Hemat; ọ gēnwe kwa akuku Iru-anyanwu na nke Ọdida-anyanwu; Dan, otù òkè.

2. N'akuku ókè-ala Dan, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Asha, otù òkè.

3. N'akuku ókè-ala Asha, site n'akuku Iru-anyanwu we rue akuku Ọdida-anyanwu; Naftali, otù òkè.

4. N'akuku ókè-ala Naftali, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Manase, otù òkè.

5. N'akuku ókè-ala Manase, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Efraim, otù òkè.