Bible Nso

Ezikiel 47:17-23 Bible Nso (IGBOB)

17. Ókè-ala site n'oké osimiri gābu kwa Haza-inon n'ókè-ala Damaskọs, ma n'Ugwu n'akuku Ugwu bu ókè-ala Hemat. Nka bu kwa akuku Ugwu.

18. Ma akuku Iru-anyanwu, site n'etiti Hauran na Damaskọs na Gilead, na ala Israel, gābu Jọdan; site n'ókè-ala Ugwu rue oké osimiri nke Iru-anyanwu ka unu gātù. Nka bu kwa akuku Iru-anyanwu.

19. Ma akuku Ndida nke nēche iru na Ndida gēsite na Tema rue miri Meribot-kedesh, rue miri-iyi Ijipt, rue oké osimiri uku. Nka bu kwa akuku Ndida nēche iru na Negeb.

20. Ma akuku Ọdida-anyanwu gābu oké osimiri uku, site n'ókè-ala Ndida rue na ncherita-iru nbata Hemat. Nka bu akuku Ọdida-anyanwu.

21. Unu ewe ketara onwe-unu ala nka dika ebo nile nke Israel si di.

22. Ọ gēru kwa, na unu gēme ka ọ dayere unu n'ihe-nketa, ka ọ daye-kwa-ra ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'etiti unu, ndi muworo umu n'etiti unu: ha gādi kwa unu dika ndi amuru n'ala n'etiti umu Israel; ha gēso unu dabà n'ihe-nketa n'etiti ebo nile nke Israel.

23. Ọ gēru kwa na, n'ebe ahu nke ọbìa nọ dika ọbìa nime ya, n'ebe ahu ka unu gēnye ya ihe-nketa-ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.