Bible Nso

Ezikiel 37:13-18 Bible Nso (IGBOB)

13. Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'meghesiri ílì-unu, na mb͕e M'mesiri ka unu si n'ílì-unu rigoputa, unu ndim.

14. M'gētiye kwa Mọm nime unu, unu ewe di ndu, M'gēme kwa ka unu nọdu n'ala-unu: unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, me ya; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

15. Okwu Jehova we ruem nti, si,

16. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, were otù osisi n'onwe-gi, de n'elu ya, Nke Juda, na nke umu Israel ndi ekekọtaworo ya na ha n'otù: were kwa osisi ọzọ, de n'elu ya, Nke Josef, osisi Efraim, na nke ulo Israel nile ndi ekekọtaworo ya na ha n'otù:

17. gi jikọta kwa ha, otù na ibe-ya, nye onwe-gi, ka ha ghọ otù osisi, ka ha we ghọ otù n'aka-gi.

18. Ma mb͕e umu ndi-gi gāgwa gi okwu, si, Ì gaghi-egosi ayi ihe ihe ndia bu n'ebe i nọ?