Mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, Gi onye nēmebi iwu, i ghaghi inwu, ma i kwughi kwa okwu idọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ-ya puta; onye ahu nke nēmebi iwu gānwu n'ajọ omume-ya; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya.