Bible Nso

Ezikiel 32:16-26 Bible Nso (IGBOB)

16. Abù-ákwá ka nka bu, nke ha gābù; umu-ndinyom nke mba nile gābù ya: n'ihi Ijipt na n'ihi ìgwè-ya nile ka ha gābù ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

17. O rue, n'arọ nke-iri-na-abua, n'ubọchi nke-iri-na-ise ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,

18. Nwa nke madu, bùara ìgwè ndi Ijipt abù ákwá, me ka ha rida, ya na umu-ndinyom nke mba di iche iche di ebube, rue ala di n'okpuru uwa, ha na ndi nārida n'olùlù.

19. Ònye ka i tọkariri n'utọ? rida, ka eme kwa ka i soro ndi anēbighi úgwù dina.

20. N'etiti ndi ejiri mma-agha b͕u ka ha gāda: ewerewo ya nye mma-agha: kpupunu ya na ìgwè ndi-ya nile.

21. Ndi di ike nke ndi-dike gēsi n'etiti ala-mọ gwa ya okwu, ha na ndi nēyere ya aka: ha aridawo, ha edinawo ala, bú ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u.

22. N'ebe ahu ka Asiria na nkpọkọta ndi ya nile di; n'ebe nile di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha:

23. ndi etiyere ílì nile ha na nsọtu nile nke olùlù, nkpọkọta ndi-ya di ílì-ya buruburu: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha, bú ndi mere ka ujọ di n'ala ndi di ndu.

24. N'ebe ahu ka Ilam na ìgwè ndi-ya nile ndi nọ ílì-ya buruburu di: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha, ndi ridara n'ebighi-úgwù rue ala di n'okpuru uwa, bú ndi mere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu, we būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù.

25. N'etiti ndi eb͕uru eb͕u ka ha nyeworo ya ihe-ndina n'etiti ìgwè ndi-ya nile; n'ebe nile di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u; n'ihi na emere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu, ha we būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù: n'etiti ndi eb͕uru eb͕u ka etiyeworo ya.

26. N'ebe ahu ka Meshek na Tubal na ìgwè ndi-ya nile nọ; n'ebe nile nke di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u; n'ihi na ha mere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu.