Bible Nso

Ezikiel 3:6-12 Bible Nso (IGBOB)

6. ọ bughi ijekuru ọtutu ndi asusu-ha miri emi nke ire-ha di kwa arọ́, ndi i dighi-anu okwu-ha. N'ezie, ọ buru na ọ bu ha ka M'zigara gi jekuru, ha onwe-ha gēge gi nti.

7. Ma ulo Israel agaghi-ekwe ige gi nti; n'ihi na ha adighi-ekwe igem nti: n'ihi na ulo Israel nile bu ndi nwere egedege-iru siri ike, ọ bu kwa ndi obi-ha siri ike ka ha bu.

8. Le, emewom iru-gi ka ọ di ike megide iru-ha, ọ bu kwa egedege-iru-gi ka M'meworo ka ọ di ike megide egedege-iru-ha.

9. Dika nkume adamant nke di ike kari ọmu, otú a ka M'meworo egedege-iru-gi: atula egwu ha, atu-kwa-la ujọ iru-ha, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.

10. O we sim, Nwa nke madu, okwum nile nke M'gāgwa gi, nara ha n'obi-gi, nuru kwa ha na nti-gi abua.

11. Je kwa, bakuru ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bakuru umu ndi-gi, gwa ha okwu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri; ma ha gānu, ma ha gāghara.

12. Mọ Chineke we buliem, m'we nu olu nke oké ùzù n'azum, si, Ihe agọziworo agọzi ka ebube Jehova bu site n'ọnọdu-Ya.