Bible Nso

Ezikiel 29:5-9 Bible Nso (IGBOB)

5. M'gātusa kwa gi n'ọzara, gi na azù nile nke osimiri Nail i nile: n'ọhia ka i gāda; agaghi - achikọta gi, agaghi-ekpokọta kwa gi: anu-ọhia nke uwa na anu-ufe nke elu-igwe ka M'wereworo gi nye ka i ghọ ihe-oriri.

6. Ndi nile bi n'Ijipt gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, n'ihi na ha aburuworo ulo Israel nkpa-n'aka nke bu nání amì.

7. Mb͕e ha jidere gi n'aka, i we nyajie, dọwara ha ubu nile: na mb͕e ha dabere gi, i we b͕ajie, me ka úkwù nile guzoro ha.

8. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, M'gaje ime ka mma-agha biakwasi gi, M'gēbipu kwa madu na anumanu nime gi.

9. Ala Ijipt gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu na nkpọnkpọ ebe; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova: n'ihi na ọ siwo, Mu nwe osimiri Nail, ọ bu kwa onwem mere ya.