Bible Nso

Ezikiel 27:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova we ruem nti, si,

2. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, buliere Taia abù-ákwá;

3. si Taia, Gi onye bi na ab͕ata oké osimiri, onye bu onye-ahia nke ndi nile di iche iche rue ọtutu agwe-etiti, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Taia, gi onwe-gi asiwo, Mu onwem bu ebe mazuru nma.

4. N'etiti oké osimiri ka ókè-ala-gi nile di, ndi wuworo gi emewo ka ima-nma-gi zue okè.