Bible Nso

Ezikiel 26:10-17 Bible Nso (IGBOB)

10. Site n'ìgwè inyinya-ya ájá-ha gēkpuchi gi: site n'olu ndi-inyinya, na nke wheel nākpọre akpọre, na nke ub͕ọ-ala, mb͕idi-gi nile gēme nkpatu, mb͕e ọ nābata n'ọnu-uzọ-ama-gi nile, dika esi abata n'obodo nke ab͕awara ab͕awa.

11. O gēji ukwu inyinya-ya nile zọtọ èzí-gi nile: ndi-gi ọ gēji mma-agha b͕u, ogidi nile nke ike-gi gārida n'ala.

12. Ha gākwata àkù-gi, luta ihe-izu-ahia-gi n'agha, kwatu mb͕idi-gi nile, ọ bu kwa ulo nile nke i nāchọsi ike ka ha gākwada: ọzọ, nkume-gi nile na osisi-gi nile awara awa na ájá-gi ka ha gātọb͕ọ n'etiti miri.

13. M'gēme kwa ka ùzù nke abù-gi nile kwusi; agaghi-anu kwa olu nke ubọ-akwara-gi nile ọzọ.

14. M'gēme kwa ka i ghọ nkume di elu nke ihe nādighi ya: ebe ib͕asa ub͕u ka i gābu; agaghi-ewu kwa gi ọzọ: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

15. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri Taia: Ọ̀ bughi site n'olu ọdida-gi, mb͕e ndi emeruru emeru nāsu ude, mb͕e anēb͕u eb͕u nke-uku n'etiti gi, ka agwe-etiti nile nēme nkpatu?

16. Ndi-isi nile nke oké osimiri gēsi n'oche-eze-ha ridata, chizuga uwe-nwuda-ha, ọ bu kwa uwe nile ha akpara nke-ọma ka ha gēyipu: ọma-jijiji nile ka ha gēyibe dika uwe; n'ala ka ha gānọdu, ma jijiji na ntabi-anya nile ọ bula, ihe-gi gēju kwa ha anya.

17. Ha gēbuli kwa abù-ákwá bayere gi, si gi, Le, otú i laworo n'iyì, gi obodo nke madu biri nime gi, bú ndi sitere n'oké osimiri nile, gi obodo nke anēto eto, nke diri ike n'oké osimiri, ya onwe-ya na ndi bi ya, ndi mere ka ndi nile ndi bi nime ya tua ujọ ha!