Bible Nso

Ezikiel 23:11-20 Bible Nso (IGBOB)

11. Nwa-nne-ya nwanyi, bú Oholiba, we hu nka, ma o bibiri onwe-ya kari nwa-nne-ya n'agu ndikom nke guru ya, na n'ikwa-iko-ya nile nke kariri ikwa-iko nile nke nwa-nne-ya.

12. Agu umu Asiria guru ya, bú ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze, ndi bu ab͕ata-obi-ya, ndi yiri uwe mab͕uru onwe-ya, ha bu ndi-inyinya nānọkwasi inyinya, umu-okọrọbia anāchọsi ike ka ha nile bu.

13. M'we hu na ọ ruru árú; otù uzọ ka ha abua siri.

14. O we tukwasi ihe n'ikwa-iko-ya; o we hu ndikom akàrari na mb͕idi, bú onyinyo ndi Kaldea eji ihe-otite nācha uhie uhie kà,

15. ndi ekereri ihe-ọkiké n'úkwù-ha, ndi ejiri ákwà esijiri esiji kebiga isi-ha ókè, n'ile ha anya ndi-isi-agha ka ha nile bu, dika oyiyi umu Babilon nke Kaldea, bú ala amuru ha.

16. Agu ha we gua ya mb͕e ọ nēle ha anya, o we zigara ha ndi-ozi rue Kaldea.

17. Umu Babilon we biakute ya n'ihe-ndina nke ikwa-iko, ha we merua ya n'ikwa-iko nile ha, o we rua árú site na ha, nkpuru-obi-ya we kewapu n'ebe ha nọ.

18. O we kpughe ikwa-iko-ya nile, kpughe kwa ọtọ-ya: nkpuru-obim we kewapu n'aru ya, dika nkpuru-obim si ekewapu n'aru nwa-nne-ya.

19. O we me ka ikwa-iko-ya nile ba uba, n'icheta ubọchi nile ọ di na nwata, mb͕e ọ kwara iko n'ala Ijipt.

20. Agu ndikom-ha nākwa iko we gua ya, ndi anu-aru-ha bu anu-aru inyinya-ibu, uré-ha bu kwa uré inyinya.