Bible Nso

Ezikiel 22:6-19 Bible Nso (IGBOB)

6. Le, ndi-isi Israel, onye ọ bula ka ogwe-aka-ya ra, anọwo nime gi iwusi ọbara.

7. Nna na nne ka ha lelìworo nime gi; ọbìa ka ha jiworo nmeb͕u emeso n'etiti gi: nwa-nb͕ei na nwanyi di-ya nwuru ka ha meworo ihe-ike nime gi.

8. Ihe nsọm nile ka i ledaworo anya, ọ bu kwa ubọchi-izu-ikem nile ka i meworo ka ha ghara idi nsọ.

9. Ndi nāb͕a àmà ọjọ anọwo nime gi iwusi ọbara: ọ bu kwa n'ugwu nile ka ha riworo ihe nime gi: ajọ ihe-nzube ka ha meworo n'etiti gi.

10. Ọtọ nna ka ekpugheworo nime gi: nwanyi nke ruru árú n'idi-na-nsọ-ya ka ha wedaworo n'ala nime gi.

11. Ọzọ, otù nwoke esorowo nwunye nke madu-ibe-ya me ihe-árú; nwoke ọzọ emeruwo nwunye nwa-ya n'ajọ ihe-nzube; nwoke ọzọ ewedawo nwa-nne-ya nwayi, bú nwa nke nna-ya, n'ala nime gi.

12. Ngo ka ha riworo nime gi iwusi ọbara; uma na ọmuru-nwa ka i naraworo, i we were nmeb͕u rita urù nēzighi ezi n'aka madu-ibe-gi nile, ma Mu onwem ka i chezọworọ, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

13. Ma, le, akuwom ọbu-akam n'ebe urù-gi nēzighi ezi nke i ritaworo di, na n'ihi ọbara-gi nke diworo n'etiti gi.

14. Obi-gi, ò gēguzo? ma-ọbu aka-gi abua, hà gādi ike n'ubọchi ndia mb͕e Mu onwem nēmeso gi? Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, me kwa ya.

15. M'gāchusa kwa gi n'etiti mba nile, fesa kwa gi n'ala nile; M'gēme kwa ka iru-árú-gi si nime gi gwusia.

16. Agēme kwa ka i ghara idi nsọ n'onwe-gi, n'anya mba nile; i we mara na Mu onwem bu Jehova.

17. Okwu Jehova we ruem nti, si,

18. Nwa nke madu, ulo Israel aghọworom afuru-uzu: ha nile bu ọla na b͕amb͕am na ígwè na opù, n'etiti oké ọku; afuru-uzu nke ọla-ọcha ka ha ghọworo.

19. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na unu nile aghọwo afuru-uzu, n'ihi nka, le, M'gaje ichikọta unu n'etiti Jerusalem.