Bible Nso

Ezikiel 21:29-32 Bible Nso (IGBOB)

29. mb͕e ha nāhuru gi ọhù efu, mb͕e ha nājuru gi ase okwu-ugha, itiye gi n'olu ndi nēmebi iwu ndi eb͕uru eb͕u, ndi ubọchi-ha abiawo, na mb͕e nke ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu.

30. Mighachi ya n'ọbọ́-ya. N'ebe ekère gi, n'ala nputa-uwa-gi, ka M'gēkpe gi ikpe.

31. M'gāwukwasi gi ajọ iwem; ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M'gēji fùkwasi gi: M'gēnye kwa gi n'aka ndikom bu nání anu-ọhia, ndi di ǹkà n'ibibi ebibi.

32. I gāghọrọ ọku nri; ọbara-gi gādi n'etiti ala-gi; agaghi-echeta gi: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.