Bible Nso

Ezikiel 11:5-9 Bible Nso (IGBOB)

5. Mọ nke Jehova we dakwasim, O we sim, Si, Otú a ka Jehova siri: Otú a ka unu siri, unu ulo Israel; ọbuná ihe nile nke nābata nime mọ-unu, Mu onwem mara ya.

6. Unu emewo ka ndi-unu eb͕uru eb͕u n'obodo a ba uba, unu emejuwo kwa èzí nile ya na ndi eb͕uru eb͕u.

7. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ndi-unu eb͕uru eb͕u ndi unu tọb͕ọworo n'etiti ya, ha onwe-ha bu anu, obodo nka bu kwa ite: ma unu ka M'gēme ka unu si nime ya puta.

8. Mma-agha ka unu tuworo egwu ya; ọ bu kwa mma-agha ka M'gēme ka ọ biakwasi unu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

9. M'gēme kwa ka unu si n'etiti ya puta, M'gēnye kwa unu n'aka ndi ala ọzọ, me ihe nile ekpere n'ikpe n'etiti unu.