Bible Nso

Ezikiel 11:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Mọ Chineke we buliem, me ka m'biarue ọnu-uzọ-ama Iru-anyanwu nke ulo Jehova, nke nēche iru n'Iru-anyanwu: ma, le, n'oghere nke ọnu-uzọ-ama ahu ka orú ndikom na ise nọ; m'we hu n'etiti ha Jeazanaia nwa Azua, na Pelataia nwa Benaia, bú ndi-isi nke ndi Israel.

2. Ọ we sim, Nwa nke madu, ndia bu ndikom ahu ndi nēchè ajọ ihe, ndi nādu kwa ọdu ọjọ n'obodo a:

3. ndi nāsi, Mb͕e iwu ulo adighi nso: obodo nka bu ite, ayi onwe-ayi bu kwa anu.

4. N'ihi nka bue amuma megide ha, bue amuma, nwa nke madu.

5. Mọ nke Jehova we dakwasim, O we sim, Si, Otú a ka Jehova siri: Otú a ka unu siri, unu ulo Israel; ọbuná ihe nile nke nābata nime mọ-unu, Mu onwem mara ya.

6. Unu emewo ka ndi-unu eb͕uru eb͕u n'obodo a ba uba, unu emejuwo kwa èzí nile ya na ndi eb͕uru eb͕u.