Bible Nso

Esta 5:4-9 Bible Nso (IGBOB)

4. Esta we si, Ọ buru na ọ di eze nma, ka eze na Heman bia ta n'ọṅuṅu-manya-vine ahu nke m'meworo ya.

5. Eze we si, Menu ka Heman me ngwa ime ihe Esta kwuru. Eze na Heman we bia n'ọṅuṅu-manya-vine nke Esta mere.

6. Eze we si Esta n'ọṅuṅu manya-vine ahu, Gini bu aririọ-gi? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēme ya.

7. Esta we za, si, Aririọm na ọchichọm bu;

8. ọ buru na ahutawom amara n'iru eze, ọ buru kwa na ọ di eze nma inye ihe m'nāriọ, na ime ihe m'nāchọ, ka eze na Heman bia n'ọṅuṅu-manya-vine nke m'gēmere ha, echi ka m'gēme kwa dika okwu eze si di.

9. Heman we pua ubọchi ahu nāṅuri ọṅu, ọ di kwa ya nma n'obi: ma mb͕e Heman huru Mọdekai n'ọnu-uzọ-ama eze, na o bilighi, na ọ maghi kwa jijiji n'iru ya, Heman juputara n'ọnuma megide Mọdekai.