Bible Nso

Esta 2:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e ihe ndia gasiri, mb͕e ọnuma eze, bú Ahasuerọs, bìri, ọ chetara Vashti, na ihe o mere, na ihe ekwubìri megide ya.

2. Ndi-ozi eze, bú ndi nējere ya ozi, we si ya, Ka ha chọrọ eze umu-ab͕ọghọ ndi nāmaghi nwoke, bú ndi di nma ile anya:

3. ka eze me kwa ndi-nlekọta n'ala nile anāchi achi nke ala-eze-ya, ka ha we chikọta umu-ab͕ọghọ nile ndi nāmaghi nwoke, bú ndi di nma ile anya, rue Shushan, bú ulo uku eze, rue ulo ndinyom, rue aka Hege, bú onozi eze, onye nēdebe ndinyom; ka enye kwa ha ihe-nsacha nile ha:

4. ka nwa-ab͕ọghọ nke di nma n'anya eze buru nwunye eze n'ọnọdu Vashti. Ihe ahu we di nma n'anya eze; o we me otú a.