Aisaia

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52
  53. 53
  54. 54
  55. 55
  56. 56
  57. 57
  58. 58
  59. 59
  60. 60
  61. 61
  62. 62
  63. 63
  64. 64
  65. 65
  66. 66

Bible Nso

Aisaia 33 Bible Nso (IGBOB)

1. Ahuhu gādiri gi onye nāpunara madu ihe, ma gi onwe-gi bu onye anāpunaraghi ihe; onye nāghọb͕u kwa aghọb͕u, ma ha aghọb͕ughi gi! mb͕e i napubìri madu ihe, agāpunara gi ihe; mb͕e i ghọb͕ubìri, ha gāghọb͕u gi.

2. Jehova, mere ayi amara; Gi ka ayi leworo anya: buru ogwe-aka-ha kwa-ututu, buru kwa nzọputa-ayi na mb͕e ahuhu.

3. Site n'olu ùzù ka ndi di iche iche b͕alagaworo; site na nbuli-Gi ka mba nile b͕asaworo.

4. Agāchikọta kwa ihe-unu akwatara n'agha dika nchikọta nke ọbubu: dika nb͕aghari nke igurube, otú a ka ọ nāb͕aghari n'elu ya.

5. Jehova di elu; n'ihi na O bi n'elu: O mejuwo Zaion n'ikpe ziri ezi na ezi omume.

6. Ikwesi-ntukwasi-obi gādi kwa na mb͕e-gi nile, iba-uba nke nzọputa na amam-ihe na ihe-ọmuma: egwu Jehova, nke ahu bu àkù-ya.

7. Le, dìnkpà-ha nile nēti nkpu n'èzì: ndi-ozi udo nākwakpọ anya.

8. Uzọ nile atuliri atuli tọb͕ọrọ n'efu, onye nāgabiga n'uzọ akwusiwo: o mebiwo ọb͕ub͕a-ndu, ju obodo nile, ọ gughi madu n'ihe.

9. Ala nēru újú, talata: Lebanon nwere iru-ihere, ọ janwuwo ajanwu: Sheron di ka ala ihe nādighi; Beshan na Kamel nārurupu kwa akwukwọ-ha.

10. Ub͕u a ka M'gēbili, ka Jehova nāsi; ub͕u a ka M'gēme onwem ka M'di elu; ub͕u a ka agēbulim.

11. Unu gātu ime ahihia kpọrọ nku, unu gāmu ahihia-ọka: nku-ume-unu bu ọku nke gērichapu unu.

12. Ndi di iche iche gādi kwa ka lime akpọrọ ọku: dika ogwu eb͕uturu eb͕utu, nke anēsure n'ọku.

13. Unu ndi nọ n'ebe di anya, nurunu ihe M'meworo; unu kwa ndi nọ nso, maranu idi-ikem.

14. Ndi-nmehie nātu oké egwu nime Zaion; ọma-jijiji ejidewo ndi emeruru emeru. Ònye n'etiti ayi gānọ dika ọbìa n'ebe ọku nērichapu erichapu di? ònye n'etiti ayi gānọ dika ọbìa n'ebe ọku nēre ere ebighi-ebi di?

15. Ọ bu onye nējeghari n'ezi omume nile, nke nēkwu kwa okwu nile ziri ezi; nke nāju urù nmeb͕u nile, nke nētichapu ọbu-aka-ya abua n'ijide ihe-iri-ngo, nke nākwuchi nti-ya abua ka ọ ghara inu okwu bayere iwusi ọbara, nke nātachi kwa anya-ya abua ka ọ ghara ilekwasi ihe ọjọ anya;

16. onye ahu gēbi n'ebe di elu: ebe ewusiri ike nke nkume di elu ka ulo-elu-ya gābu: anēnye ya nri-ya; miri-ya kwesiri ntukwasi-obi.

17. Eze n'ima-nma-ya ka anya-gi abua gāhu: ha gāhu ala nke ebe nile ọ sọturu di anya.

18. Obi-gi gēchè èchìchè oké ujọ ahu: òle ebe onye nāgu ọnu nọ? òle ebe onye nātù ego-utu nọ? òle ebe onye nāgu ulo-elu ọnu nọ?

19. Ndi ahu nke nwere anya-ike, i gaghi-ahu ya, bú ndi asusu-ya miri emi kari ọnunu; nke ire-ya nāsu nsu nādighi nghọta.

20. Lekwasi Zaion anya, bú obodo nke mb͕e nile ayi akara àkà: anya-gi abua gāhu Jerusalem na ọ bu ulo-obibi di jū, ulo-ikwū nke anāgaghi-ebupu ebupu, nke anāgaghi-eropu ǹtú-ya ọ bula rue ebighi-ebi, nke anāgaghi-adọbi kwa udọ̀-ya ọ bula.

21. Kama n'ebe ahu ka Onye di ebube, bú Jehova, gānọduru ayi, dika ebe ọtutu osimiri na uzọ di iche iche miri si erù nke sara mbara n'aka abua; ub͕ọ-umara agaghi-aga nime ya, ub͕ọ di ebube agaghi-agabiga kwa n'elu ya.

22. N'ihi na Jehova bu onye-ikpe-ayi, Jehova bu onye nēnye ayi iwu, Jehova bu eze-ayi; Ya onwe-ya gāzoputa ayi.

23. Atọsawo udọ̀-gi nile; ha adighi-ejisi ukwu akpu-ha ike, ha ab͕asaghi ọkọlọtọ-ha: mb͕e ahu ekesara ihe alutara n'agha, bú ihe akwatara n'uba; ndi-ngwurọ lutara ihe-nluta-n'agha.