9. Ka okpo-ọnu-gi di kwa ka manya-vine makarisiri nma,Nke nāsughari n'iko nke-ọma nye onye ihe-ya nātọm utọ,Nke nērùbà nwayọ n'eb͕ub͕ere-ọnu abua nke ndi nāraru ura.
10. Mu onwem bu nke onye ihe-ya nātọm utọ,N'arum ka ọchichọ-ya di kwa.
11. Bia, gi onye ihe-gi nātọm utọ, ka ayi pua ba n'ọhia;Ka ayi nọ ọnọdu-abali n'obodo ntà.
12. Ka ayi bilie n'isi-ututu je rue ubi-vine nile;Ka ayi hu ma osisi vine amawo ifuru,Ma okoko-ya ab͕awawo, Ma osisi pomegranate ab͕awawo okoko:N'ebe ahu ka m'gēnye gi ihu-n'anyam.