Bible Nso

Abù Nke Abù 7:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Le ka nzọ-ukwu-gi nile si ma nma n'akpukpọ-ukwu sandal, gi nwa-nwanyi nke onye amara aha-ya!Apata-ukwu-gi abua nke di buruburu di ka ihe-ichọ-nma,Ọlu aka onye-ǹkà.

2. Otubo-gi di ka ọkwa di buruburu,Ka manya-vine agwara agwa ghara ikọ nime ya:Afọ-gi di ka obo ọka wheatNke eji urodi b͕a ya buruburu.

3. Ara-gi abua di ka umu-mb͕ada abuaNke bu umu abua nke otù nne-mb͕ada muru.

4. Olu-gi di ka ulo-elu nke ọdú;Anya-gi abua di ka ọdọ-miri nke di nime Heshbon, n'akuku ọnu-uzọ-ama Bat-rabim;Imi-gi di ka ulo-elu LebanonNke chere Damaskọs iru.