Bible Nso

1. Ndi-Eze 9:5-14 Bible Nso (IGBOB)

5. M'gēme kwa ka oche-eze ala-eze-gi n'isi Israel guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi; dika M'gwara Devid, bú nna-gi, okwu si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n'inọkwasi n'oche-eze Israel.

6. Ma ọ buru na unu esi n'isom laghachi ma-ọli, unu onwe-unu ma-ọbu umu-unu, unu-we ghara idebe ihe nile M'nyere n'iwu na ukpurum nile nke M'tiyeworo n'iru unu, unu we je fè chi ọzọ òfùfè, kpọ isi ala nye ha:

7. M'gēbipu kwa Israel n'elu ala nka nke M'nyeworo ha; M'gēsi kwa n'irum tupu ulo a, nke M'doworo nsọ nye aham; Israel gāghọ kwa ilu na ihe-àkùkù n'etiti ndi ọzọ nile:

8. ulo a kwa, nke kachasi elu, o gēju onye ọ bula nke nāgabiga ya anya, ọ gāma ọsọ; ha gāsi kwa, N'ìhi gini ka Jehova meworo ala nka na ulo a otú a?

9. Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke-ha, Onye mere ka ndi bu nna-ha si n'ala Ijipt puta, ha we jide chi ọzọ, kpọ isi ala nye ha, fè ha òfùfè: n'ihi ya ka Jehova meworo ka ihe ọjọ a nile biakwasi ha.

10. O rue, n'ọgwugwu orú arọ, nke Solomon wuru ulo abua nime ha, bú ulo Jehova na ulo eze,

11. (ma Hairam, bú eze Taia, were osisi cedar, were kwa osisi fir, were kwa ọla-edo, yere Solomon aka, dika ihe nile si di nke nātọ ya utọ,) na eze Solomon nyere Hairam orú obodo n'ala Galili mb͕e ahu.

12. Hairam we si na Taia puta ihu orú obodo ahu nke Solomon nyere ya; ma ha ezighi ezi n'anya-ya.

13. O we si, Gini bu obodo ndia nke i nyeworom, nwa-nnem? Ọ we kpọ ha ala Kabul, rue ta.

14. Hairam we zigara eze ọgu talent ọla-edo isi.