Bible Nso

1. Ndi-Eze 9:13-19 Bible Nso (IGBOB)

13. O we si, Gini bu obodo ndia nke i nyeworom, nwa-nnem? Ọ we kpọ ha ala Kabul, rue ta.

14. Hairam we zigara eze ọgu talent ọla-edo isi.

15. Ma nka bu ihe kpatara usu ndi nēfè òfùfè nke eze, bú Solomon, weputara; iwu ulo Jehova, na ulo nke aka ya, na Milo, na mb͕idi Jerusalem, na Hezoa, na Megido, na Gezea.

16. N'ihi na Fero, bú eze Ijipt, rigoro, were Gezea, sure ya n'ọku, b͕ue ndi Kenean ndi bi n'ọbodo ahu, were ya nye nwa-ya nwayi, bú nwunye Solomon, ka ọ buru ihe idu-ulo.

17. Solomon we wue Gezea, na Bet-horon di n'okpuru,

18. na Bealat, na Tema n'ọzara, n'ala-ya,

19. na obodo nile nke nchikọbata-ihe nke Solomon nwere, na obodo nile nke ub͕ọ-ala-ya, na obodo nile nke ndi-inyinya-ya, na ihe di Solomon ezi nma n'obi, bú nke di ya ezi nma n'obi iwu na Jerusalem, na nime Lebanon, na n'ala nile ọ nāchi.