Bible Nso

1. Ndi-Eze 7:44-47 Bible Nso (IGBOB)

44. na otù oké osimiri ahu, na ehi iri na abua ahu nke di n'okpuru oké osimiri;

45. na ite nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile: ma ihe ndia nile, nke Hairam mere eze, bú Solomon, n'ulo Jehova, bu ọla nēb͕u maramara.

46. Na buruburu-ala Jọdan ka eze wuru ha, n'ala urọ n'etiti Sukot na Zaretan.

47. Solomon we dọba ihe ahu nile ghara itù ha, n'ihi na ha bara uba nke ukwu: achọputaghi ọtùtù ọla ahu.