43. na ihe-ndọkwasi iri ahu, na ite ọsisa-miri iri ahu nke di n'elu ihe-ndọkwasi;
44. na otù oké osimiri ahu, na ehi iri na abua ahu nke di n'okpuru oké osimiri;
45. na ite nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile: ma ihe ndia nile, nke Hairam mere eze, bú Solomon, n'ulo Jehova, bu ọla nēb͕u maramara.
46. Na buruburu-ala Jọdan ka eze wuru ha, n'ala urọ n'etiti Sukot na Zaretan.