Bible Nso

1. Ndi-Eze 6:25-30 Bible Nso (IGBOB)

25. Cubit iri ka cherub nke-ọzọ di kwa: cherubim abua ahu nwere otù ọtùtù na otù ọpipi.

26. Idi-elu otù cherub di cubit iri, otú a ka cherub nke-ọzọ di kwa.

27. O we tiye cherubim n'etiti ime-ulo: ha we b͕asa nkù cherubim ahu, nkù nke otù we metu mb͕idi, nkù cherub nke-ọzọ nēmetu kwa mb͕idi nke-ọzọ; nkù-ha nēmeturita onwe-ha, nkù na nkù, n'etiti ulo ahu.

28. Ọ machita cherubim ọla-edo.

29. Ọ tu-kwa-ra mb͕idi nile nke ulo ahu buruburu n'eb͕ub͕u nke ihe-ọpipi, bú cherubim na nkwu na okoko-osisi wara awa, n'ime na n'èzí.

30. Ọ machita-kwa-ra ala ulo ahu ọla-edo, n'ime na n'èzí.