Bible Nso

1. Ndi-Eze 4:19-34 Bible Nso (IGBOB)

19. Gebea nwa Uri, n'ala Gilead, bú ala Saihon eze ndi-Amorait na nke Og, bú eze Beshan; ma nání ya bu onye edoro onye-isi nke di n'ala ahu.

20. Juda na Israel di ọtutu, dika ájá nke di n'akuku oké osimiri n'iba-uba, nēri ihe, nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nāṅuri kwa ọṅu.

21. Solomon we nāchi ala-eze nile site n'Osimiri rue ala ndi Filistia, ru kwa ókè-ala Ijipt: ha nēweta nso onyinye-inata-iru-ọma, nēfè kwa Solomon òfùfè ubọchi nile nke ndu-ya.

22. Ihe-oriri Solomon nke diri otù ubọchi bu kwa orú ọtùtù ọka na iri nke utu ọka flour, na ọgu ọtùtù ọka atọ nke utu ọka;

23. ehi iri mara abuba, na orú ehi site n'ebe anāzù anu, na ọgu aturu ise, nāgughi ele, na mb͕ada, na ob͕o-miri, na ọkuku emere ka ha ma abuba.

24. N'ihi na ya onwe-ya nwere ike n'aru ndi nile bi n'ofè Osimiri, site na Tifsa we rue Geza, bú n'aru eze nile n'ofè Osimiri: o nwe-kwa-ra udo site n'ofè ọzọ nile di ya buruburu.

25. Juda na Israel we biri na ntukwasi-obi, nwoke ọ bula n'okpuru osisi vine ya na n'okpuru osisi fig ya, site na Dan we rue na Biasheba, ubọchi nile nke Solomon.

26. Solomon nwe-kwa-ra orú nnù ulo uzọ ise nke inyinya diri ub͕ọ-ala-ya, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri.

27. Ndi ahu edoro ndi-isi zù-kwa-ra eze, bú Solomon, na ndi nile nābiaru table nke eze Solomon nso, nwoke ọ bula n'ọnwa-ya: ha ekweghi ka ihe ọ bula kọ ukọ.

28. Ha nēweta kwa ọka barley na okporo-ọka n'ebe ndi ahu edoro ndi-isi nọ, nwoke ọ bula dika ihe ekpere ya n'ikpe si di, inye inyinya na inye inyinya ukwu ọsọ.

29. Chineke nye-kwa-ra Solomon amam-ihe na nghọta riri nne nke-uku, na obi sara mbara, dika ájá nke di n'usọ oké osimiri.

30. Amam-ihe Solomon we ba uba kari amam-ihe umu Iru-anyanwu nile, kari kwa amam-ihe Ijipt nile.

31. Ọ we mara ihe kari madu nile; kari Itan onye-Ezrahait, na Himan, na Kalkol, na Dada, bú umu-ndikom Mahol: aha-ya we di na mba nile b͕ara ha buruburu.

32. Ọ tua nnù ilu asa na ọgu iri: abù-ya di kwa nnù abua na ọgu iri na abù ise.

33. O kwu-kwa-ra okwu bayere osisi, site na cedar nke di na Lebanon we rue hyssop nke nēpuputa na mb͕idi: o kwu-kwa-ra okwu bayere anu, baye-kwa-ra anu-ufe, baye-kwa-ra ihe nākpu akpu, baye-kwa-ra azù.

34. Ha we si na ndi nile bia inu amam-ihe Solomon, si n'eze nile nke uwa, bú ndi nuru amam-ihe-ya.