Bible Nso

1. Ndi-Eze 4:13-23 Bible Nso (IGBOB)

13. Ben-geba, nime Remot-gilead; ya nwere Havot nke Jaia nwa Manase, nke di na Gilead; ya nwere akuku Agob, nke di na Beshan, ọgu obodo uku atọ nke nwere mb͕idi na nkpọrọ ọla:

14. Ahinadab nwa Ido, nime Mahanaim:

15. Ahimaaz, nime Naftali; onye ahu lu-kwa-ra Basemat nwa Solomon na nwunye:

16. Beana nwa Hushai, n'Asha na Bealot:

17. Jehoshafat nwa Parua, n'Isaka:

18. Shimai nwa Ila, nime Benjamin:

19. Gebea nwa Uri, n'ala Gilead, bú ala Saihon eze ndi-Amorait na nke Og, bú eze Beshan; ma nání ya bu onye edoro onye-isi nke di n'ala ahu.

20. Juda na Israel di ọtutu, dika ájá nke di n'akuku oké osimiri n'iba-uba, nēri ihe, nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nāṅuri kwa ọṅu.

21. Solomon we nāchi ala-eze nile site n'Osimiri rue ala ndi Filistia, ru kwa ókè-ala Ijipt: ha nēweta nso onyinye-inata-iru-ọma, nēfè kwa Solomon òfùfè ubọchi nile nke ndu-ya.

22. Ihe-oriri Solomon nke diri otù ubọchi bu kwa orú ọtùtù ọka na iri nke utu ọka flour, na ọgu ọtùtù ọka atọ nke utu ọka;

23. ehi iri mara abuba, na orú ehi site n'ebe anāzù anu, na ọgu aturu ise, nāgughi ele, na mb͕ada, na ob͕o-miri, na ọkuku emere ka ha ma abuba.